اِهْدِنَا الصِّرَاطَ الْمُسْتَقِيْمَۙ
ihdinaṣ-ṣirāṭal-mustaqīm(a).
Gosi anyị ụzọ kwụ ọtọ,
صِرَاطَ الَّذِيْنَ اَنْعَمْتَ عَلَيْهِمْ ەۙ غَيْرِ الْمَغْضُوْبِ عَلَيْهِمْ وَلَا الضَّاۤلِّيْنَ ࣖ
Ṣirāṭal-lażīna an‘amta ‘alaihim, gairil-magḍūbi ‘alaihim wa laḍ-ḍāllīn(a).
(ya bụ) ụzọ ndị I meere amara; ọ bụghị (ụzọ) ndị iwe were, ọ bụghịkwa (ụzọ) ndị kpafuru akpafu.
۞ سَيَقُوْلُ السُّفَهَاۤءُ مِنَ النَّاسِ مَا وَلّٰىهُمْ عَنْ قِبْلَتِهِمُ الَّتِيْ كَانُوْا عَلَيْهَا ۗ قُلْ لِّلّٰهِ الْمَشْرِقُ وَالْمَغْرِبُۗ يَهْدِيْ مَنْ يَّشَاۤءُ اِلٰى صِرَاطٍ مُّسْتَقِيْمٍ
sayāqūlus-sufahā'u minan-nāsi mā wallāhum ‘an qiblatihimul-latī kānū ‘alaihā, qul lillāhil-masyriqu wal-magrib(u), yahdī may yasyā'u ilā ṣirāṭim mustaqīm(in).
Ndị na-enweghị nghọta n'etiti ụmụ mmadụ ga-asị, "Gịnị mere ka ha (ndị Alakụba) si n'ebe ha na-agabu (n'ebe ha na-agabu) pụọ?" Sị (Muhammad), "Ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ nke Allah; Ọ na-eduzi onye ọ bụla Ọ chọrọ gaa n'ụzọ kwụ ọtọ."
اِنَّ اللّٰهَ رَبِّيْ وَرَبُّكُمْ فَاعْبُدُوْهُ ۗهٰذَا صِرَاطٌ مُّسْتَقِيْمٌ
innallāha rabbī wa rabbukum fa‘budūh(u), hāżā ṣirāṭum mustaqīm(un).
N'ezie, Allah bụ Onyenwe m na Onyenwe unu, ya mere fee Ya ofufe. Nke a bụ ụzọ ziri ezi.
وَاَنَّ هٰذَا صِرَاطِيْ مُسْتَقِيْمًا فَاتَّبِعُوْهُ ۚوَلَا تَتَّبِعُوا السُّبُلَ فَتَفَرَّقَ بِكُمْ عَنْ سَبِيْلِهٖ ۗذٰلِكُمْ وَصّٰىكُمْ بِهٖ لَعَلَّكُمْ تَتَّقُوْنَ
wa anna hāżā ṣirāṭī mustaqīman fattabi‘ūh(u), wa lā tattabi‘us-subula fa tafarraqa bikum ‘an sabīlih(ī), żālikum waṣṣākum bihī la‘allakum tattaqūn(a).
N'ezie, nke a bụ ụzọ m kwụ ọtọ. Ya mere, soronụ ya! Unu esola ụzọ ndị ọzọ ga-eme ka unu si n'ụzọ Ya pụọ. Otu a ka O si nye unu iwu ka unu bụrụ ndị na-efe Chineke.
وَاللّٰهُ يَدْعُوْآ اِلٰى دَارِ السَّلٰمِ ۚوَيَهْدِيْ مَنْ يَّشَاۤءُ اِلٰى صِرَاطٍ مُّسْتَقِيْمٍ
wallāhu yad‘ū ilā dāris-salām(i), wa yahdī may yasyā'u ilā ṣirāṭim mustaqīm(in).
Allah na-akpọkwa (ụmụ mmadụ) òkù gaa Darus Salam (eluigwe), ma na-eduzi onye ọ bụla Ọ chọrọ gaa n'ụzọ kwụ ọtọ (Islam)
قَالَ هٰذَا صِرَاطٌ عَلَيَّ مُسْتَقِيْمٌ
qāla hāżā ṣirāṭun ‘alayya mustaqīm(un).
O (Allah) kwuru sị, "Nke a bụ ụzọ kwụ ọtọ (na-eduga) m."
وَضَرَبَ اللّٰهُ مَثَلًا رَّجُلَيْنِ اَحَدُهُمَآ اَبْكَمُ لَا يَقْدِرُ عَلٰى شَيْءٍ وَّهُوَ كَلٌّ عَلٰى مَوْلٰىهُ ۗ اَيْنَمَا يُوَجِّهْهُّ لَا يَأْتِ بِخَيْرٍ ۖهَلْ يَسْتَوِيْ هُوَۙ وَمَنْ يَّأْمُرُ بِالْعَدْلِ وَهُوَ عَلٰى صِرَاطٍ مُّسْتَقِيْمٍ ࣖ
wa ḍaraballāhu maṡalar rajulaini aḥaduhumā abkamu lā yaqdiru ‘alā syai'iw wa huwa kallun ‘alā maulāh(u), ainamā yuwajjihhu lā ya'ti bikhair(in), hal yastawī huw(a), wa may ya'muru bil-‘adli wa huwa ‘alā ṣirāṭim mustaqīm(in).
Allah (kwa) mere ihe atụ, mmadụ abụọ, otu n'ime ha dara ogbi, enweghị ike ime ihe ọ bụla, o wee bụrụ ibu arọ nye onye nlekọta ya, ebe ọ bụla e zigara ya (site n'aka onye nlekọta ya), ọ nweghị ike iweta ihe ọma ọ bụla ma ọlị. Onye ahụ ọ̀ bụ otu onye ahụ na onye na-enye iwu ka e mee ikpe ziri ezi, ọ nọkwa n'ụzọ kwụ ọtọ?
وَاِنَّ اللّٰهَ رَبِّيْ وَرَبُّكُمْ فَاعْبُدُوْهُ ۗهٰذَا صِرَاطٌ مُّسْتَقِيْمٌ
wa innallāha rabbī wa rabbukum fa‘budūh(u), hāżā ṣirāṭum mustaqīm(un).
(Aịza kwuru), "N'ezie, Allah bụ Onyenwe m na Onyenwe unu, ya mere fee Ya ofufe. Nke a bụ ụzọ ziri ezi."
وَاَنِ اعْبُدُوْنِيْ ۗهٰذَا صِرَاطٌ مُّسْتَقِيْمٌ
wa ani‘budūnī, hāżā ṣirāṭum mustaqīm(un).
feekwa m ofufe. Nke a bụ ụzọ ziri ezi.”