وَلْتَكُنْ مِّنْكُمْ اُمَّةٌ يَّدْعُوْنَ اِلَى الْخَيْرِ وَيَأْمُرُوْنَ بِالْمَعْرُوْفِ وَيَنْهَوْنَ عَنِ الْمُنْكَرِ ۗ وَاُولٰۤىِٕكَ هُمُ الْمُفْلِحُوْنَ
waltakum minkum ummatuy yad‘ūna ilal-khairi wa ya'murūna bil-ma‘rūfi wa yanhauna ‘anil-munkar(i), wa ulā'ika humul-mufliḥūn(a).
Ka otu ìgwè mmadụ dị n'etiti unu, ndị na-akpọku ezi omume, na-enye iwu (ime) ihe ọma, ma na-egbochi ihe ọjọọ. Ha bụkwa ndị nwere ihu ọma.
يٰٓاَيُّهَا الَّذِيْنَ اٰمَنُوْا مَنْ يَّرْتَدَّ مِنْكُمْ عَنْ دِيْنِهٖ فَسَوْفَ يَأْتِى اللّٰهُ بِقَوْمٍ يُّحِبُّهُمْ وَيُحِبُّوْنَهٗٓ ۙاَذِلَّةٍ عَلَى الْمُؤْمِنِيْنَ اَعِزَّةٍ عَلَى الْكٰفِرِيْنَۖ يُجَاهِدُوْنَ فِيْ سَبِيْلِ اللّٰهِ وَلَا يَخَافُوْنَ لَوْمَةَ لَاۤىِٕمٍ ۗذٰلِكَ فَضْلُ اللّٰهِ يُؤْتِيْهِ مَنْ يَّشَاۤءُۗ وَاللّٰهُ وَاسِعٌ عَلِيْمٌ
yā ayyuhal-lażīna āmanū may yartadda minkum ‘an dīnihī fa saufa ya'tillāhu biqaumiy yuḥibbuhum wa yuḥibbūnah(ū), ażillatin ‘alal-mu'minīna a‘izzatin ‘alal-kāfirīn(a), yujāhidūna fī sabīlillāhi wa lā yakhāfūna laumata lā'im(in), żālika faḍlullāhi yu'tīhi may yasyā'(u), wallāhu wāsi‘un ‘alīm(un).
Unu ndị kwere ekwe! Onye ọ bụla n'ime unu si n'okpukpe ya pụọ, mgbe ahụ Allah ga-eweta otu ndị, Ọ ga-ahụ ha n'anya ma hụ Ya n'anya, ma nwee obiọma n'ebe ndị kwere ekwe nọ, mana Ọ ga-eme ihe ike megide ndị na-ekweghị ekwe, ndị na-agba mbọ n'ụzọ Allah, ndị na-anaghị atụ egwu mkparị nke ndị na-achọ ịkatọ. Nke ahụ bụ onyinye Allah nke Ọ na-enye onye ọ bụla Ọ chọrọ. Allah bụkwa Onye Gbara Ihe Nile (onyinye Ya), Onye Maara Ihe Nile.
۞ وَمَا كَانَ الْمُؤْمِنُوْنَ لِيَنْفِرُوْا كَاۤفَّةًۗ فَلَوْلَا نَفَرَ مِنْ كُلِّ فِرْقَةٍ مِّنْهُمْ طَاۤىِٕفَةٌ لِّيَتَفَقَّهُوْا فِى الدِّيْنِ وَلِيُنْذِرُوْا قَوْمَهُمْ اِذَا رَجَعُوْٓا اِلَيْهِمْ لَعَلَّهُمْ يَحْذَرُوْنَ ࣖ
wa mā kānal-mu'minūna liyanfirū kāffah(tan), falau lā nafara min kulli firqatim minhum ṭā'ifatul liyatafaqqahū fid-dīni wa liyunżirū qaumahum iżā raja‘ū ilaihim la‘allahum yaḥżarūn(a).
Ọ dịghịkwa mma ka ndị kwere ekwe niile gaa (n'ọgbọ agha). Gịnị mere ụfọdụ n'ime otu ha anaghị aga ime ka ihe ọmụma okpukpe ha dịkwuo omimi ma dọọ ndị ha aka ná ntị mgbe ha lọtara, ka ha wee chebe onwe ha?