۞ يٰٓاَيُّهَا الَّذِيْنَ اٰمَنُوْا كُوْنُوْا قَوَّامِيْنَ بِالْقِسْطِ شُهَدَاۤءَ لِلّٰهِ وَلَوْ عَلٰٓى اَنْفُسِكُمْ اَوِ الْوَالِدَيْنِ وَالْاَقْرَبِيْنَ ۚ اِنْ يَّكُنْ غَنِيًّا اَوْ فَقِيْرًا فَاللّٰهُ اَوْلٰى بِهِمَاۗ فَلَا تَتَّبِعُوا الْهَوٰٓى اَنْ تَعْدِلُوْا ۚ وَاِنْ تَلْوٗٓا اَوْ تُعْرِضُوْا فَاِنَّ اللّٰهَ كَانَ بِمَا تَعْمَلُوْنَ خَبِيْرًا
yā ayyuhal-lażīna āmanū kūnū qawwāmīna bil-qisṭi syuhadā'a lillāhi wa lau ‘alā anfusikum awil-wālidaini wal-aqrabīn(a), iy yakun ganiyyan au faqīran fallāhu aulā bihimā, falā tattabi‘ul-hawā an ta‘dilū, wa in talwū au tu‘riḍū fa innallāha kāna bimā ta‘malūna khabīrā(n).
Unu ndị kwere ekwe! Bụrụnụ ndị na-akwado ikpe ziri ezi, ndị akaebe maka Allah, ọ bụrụgodị na ọ bụ megide onwe unu ma ọ bụ ndị mụrụ unu na ndị ikwu unu. Ma ọ bụ onye a na-ebo ebubo ma ọ bụ onye ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, Allah maara ihe kacha mma maka ọdịmma ya. Ya mere, agbasola ọchịchọ nke unu, na-achọ ịpụ n'eziokwu. Ọ bụrụkwa na unu agbagọọ (àmà) ma ọ bụ jụ inye ya, mara na Allah maara ihe niile unu na-eme.
يٰٓاَيُّهَا الَّذِيْنَ اٰمَنُوْا كُوْنُوْا قَوَّامِيْنَ لِلّٰهِ شُهَدَاۤءَ بِالْقِسْطِۖ وَلَا يَجْرِمَنَّكُمْ شَنَاٰنُ قَوْمٍ عَلٰٓى اَلَّا تَعْدِلُوْا ۗاِعْدِلُوْاۗ هُوَ اَقْرَبُ لِلتَّقْوٰىۖ وَاتَّقُوا اللّٰهَ ۗاِنَّ اللّٰهَ خَبِيْرٌۢ بِمَا تَعْمَلُوْنَ
yā ayyuhal-lażīna āmanū kūnū qawwāmīna lillāhi syuhadā'a bil-qisṭi wa lā yajrimannakum syana'ānu qamin ‘alā allā ta‘dilū, i‘dilū, huwa aqrabu lit-taqwā wattaqullāh(a), innallāha khabīrum bimā ta‘malūn(a).
Unu ndị kwere ekwe! Bụrụnụ ndị na-eme ihe ziri ezi maka Allah, (mgbe) unu bụ ndị akaebe ziri ezi. Ekwekwala ka ịkpọasị unu megide mmadụ gbaa unu ume ime ihe na-ezighị ezi. Na-ekpe ikpe ziri ezi. N'ihi na (ezi) dị nso karịa nsọpụrụ Chineke. Ma tụọ egwu Allah, n'ezie, Allah na-akpachara anya n'ihe unu na-eme.