۞ اِنَّ قَارُوْنَ كَانَ مِنْ قَوْمِ مُوْسٰى فَبَغٰى عَلَيْهِمْ ۖوَاٰتَيْنٰهُ مِنَ الْكُنُوْزِ مَآ اِنَّ مَفَاتِحَهٗ لَتَنُوْۤاُ بِالْعُصْبَةِ اُولِى الْقُوَّةِ اِذْ قَالَ لَهٗ قَوْمُهٗ لَا تَفْرَحْ اِنَّ اللّٰهَ لَا يُحِبُّ الْفَرِحِيْنَ
inna qārūna kāna min qaumi mūsā fabagā ‘alaihim, wa ātaināhu minal-kunūzi mā inna mafātiḥahū latanū'u bil-‘uṣbati ulil-quwwah(ti), iż qāla lahū qaumuhū lā tafraḥ, innallāha lā yuḥibbul-fariḥīn(a).
N'ezie, Karun so n'ime ndị Mosis, mana o mesoro ha ihe n'ụzọ na-ezighị ezi, anyị enyewokwa ya ụlọ akụ nke mkpịsị ugodi ya dị arọ nke ukwuu maka ọtụtụ ndị dike ibu. (Cheta) mgbe ndị ya gwara ya, "Ebula onwe gị n'elu. N'ezie, Allah anaghị amasị ndị na-anya isi."
قَالَ اِنَّمَآ اُوْتِيْتُهٗ عَلٰى عِلْمٍ عِنْدِيْۗ اَوَلَمْ يَعْلَمْ اَنَّ اللّٰهَ قَدْ اَهْلَكَ مِنْ قَبْلِهٖ مِنَ الْقُرُوْنِ مَنْ هُوَ اَشَدُّ مِنْهُ قُوَّةً وَّاَكْثَرُ جَمْعًا ۗوَلَا يُسْـَٔلُ عَنْ ذُنُوْبِهِمُ الْمُجْرِمُوْنَ
qāla innamā ūtītuhū ‘alā ‘ilmin ‘indī, awalam ya‘lam annallāha qad ahlaka min qablihī minal-qurūni man huwa asyaddu minhu quwwataw wa akṡaru jam‘ā(n), wa lā yus'alu ‘an żunūbihimul-mujrimūn(a).
Ọ (Karun) kwuru, sị, "N'ezie, e nyere m (akụ̀ ahụ), naanị n'ihi ihe ọmụma m nwere." Ọ̀ maghị na Allah ebibiela ndị gara aga bụ́ ndị siri ike karịa ya, ma chịkọta akụnụba karịa? Ọ dịghịkwa mkpa ka a jụọ ndị mmehie ahụ gbasara mmehie ha.
وَقَارُوْنَ وَفِرْعَوْنَ وَهَامٰنَۗ وَلَقَدْ جَاۤءَهُمْ مُّوْسٰى بِالْبَيِّنٰتِ فَاسْتَكْبَرُوْا فِى الْاَرْضِ وَمَا كَانُوْا سٰبِقِيْنَ ۚ
wa qārūna wa fir‘auna wa hāmān(a), wa laqad jā'ahum mūsā bil-bayyināti fastakbarū fil-arḍi wa mā kānū sābiqīn(a).
na (kwa) Karun, Fero na Haman. N'ezie, Mozis bịakwutere ha na (wetara) ozi doro anya. Ma ha na-eme ihe nganga n'ụwa, ha bụkwa ndị na-anaghị agbanahụ (ntara ahụhụ Chineke).